Sunday Reading
September 28, 2025Events
Twenty-sixth Sunday in Ordinary Time September 28th, 2025. 1st Reading Amos 6:1a, 4-7 2nd Reading 1 Timothy 6:11-16. Gospel Luke 16:19 -31.
IZU NKE IRI ABỤỌ NA ISII N’OGE NA-ADANYEGHỊ N’EMUME – AFỌ NKE ATỌ
UKWE MBATA: Dan 3:31,29,30,43,42
Onyenweanyị, I kpeela anyị ikpe ma nye anyị ntaramahụhụ ziri ezi, n’ihina anyị emeela njọ megide gị. Anyị egeghị ntị n’iwu gị. Ma ugbu a, nye anyị nzọpụta nke tosiri ọrụ ebube niile I na-arụ.
EKPERE MMEGHE:
Ka anyị rịọ arịrịọ
Chineke anyị, na nnukwu ebere na mgbaghara Gị ka Ị na-egosị ike Gị pụrụ ime ihe niile. Biko hukwasa anyị amara Gị n’akwụsịghị akwụsị. Nyere anyị aka ka anyị were ọsọ na-agbaga na nkwa I kwere anyị, wee bịa keta oke n’añụrị nke eluigwe. Site na Dinwenụ anyị ….
Ma ọ bụ
Ka anyị rịọ arịrịọ
Nna nke Onyenweanyị Jesu kristi, I gosịrị anyị ịdị mma nke Gị. Site n’ebere Gị na-enweghị ngwụcha, Ị na-agbaghara anyị njọ anyị mgbe dum. Biko mee ka ike ịhụnanya nke a nọrọ n’obi anyị oge niile. Wetara ndị niile anyị na ha na-emekọrịta mgbaghara; kpọbatakwa ha n’alaeze Gị. Site na Dinwenụ anyị ….
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ
Ihe ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs 6: 1, 4-7
Ndị na-ebitọgharị ndụ na ndị na-abụgharị abụ na-enweghị isi ka a ga-achụpụ, zilaa mba ọzọ.
Azigba ndị ahụ na-ebi ndụ na Zayọn na ndị ahụ chere na ọ dịghị nsogbu ọbụla dị n’ebe ha nọ n’ugwu Sameria, ha bụ ndị a maara aha ha, bụ ndị agbụrụ Izrel na-agakwuru. Azigba ụnụ ndị na-edina n’akwa ọdụ dị oke ọnụ, na-agbatị onwe ha n’elu akwa ha, na-eri anụ nwaatụrụ mara mma, na-anụ ụmụ ahi gbara abuba; ndị na-ekwe ukwe efu n’ụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọrọ onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere; bụ onye na-añụ mmanya n’ime iko buru ibu, ma werekwa mmanụ kacha ibe ya mma na-achọ onwe ha mma, ọ naghị ewute ha maka mmebi nke Josef, N’ihi ya, ha ga-abụ ndị mbụ a ga-adọkpụrụ n’ohu, oke oriri na ọñụñụ nke ndị na-agbatị onwe ha n’elu akwa ga-akwụsị.
Okwu Nke Osebụrụwa
Ekele dịrị Chukwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 146: 7, 8-9, 9-10
Azịza (V. 2): Mkpụrụ obi m too Onyenweanyị.
- Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi ebeebe
Ọ na-enye ndị a na-emegbu emegbu ikpe nkwụmọtọ
Ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri
Ọ na-emekwa ka ndị e ji eji nwere onwe ha. Az./
- Onyenweanyị na-eme ka ndịisi hụ ụzọ
Onyenweanyị na-ebulite ndị ibu arọ nyịdara n’ala
Onyenweanyị hụrụ ndị eziomume n’anya
Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa. Az./
- Ọ na-echekwaba ndị na enweghị nne na nna na ndị ajadu
Onyenweanyị na-eme ka ihe siere ndi obi ọjọọ ike
Onyenweanyị ga-achị eze ebeebe
Chineke gị, O Zayọn, ga-achị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. Az./
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ
Ihe ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Mbụ Pọl degaara Timoti 6:11-16
Mezugbado ihe niile e tiiri Gị n’iwu ruo mgbe Onyenweanyị Jesu Kristi ga-abịa ọzọ
Ma gị onwe gị, onye nke Chineke, na-agbaso eziomume, ibi ndụ yiri onye nke Chineke, okwukwe, ịhụnaanya, ntachiobi, na ịdị nwayọọ. Lụsie ọgụ nke okwukwe ahụ ike, jide ndụ ebighịebi aka, nke Chineke kpọrọ gị ka ị nata n’oge ahụ I kwupụtara ezi okwukwe gị n’ihu ọtụtụ ndị akaebe. N’ihu Chineke onye na-enye ihe niile ndụ na n’ihu Jesu Kristi, onye gbara akebe banyere ezi nkwupụta ahụ n’ihu Pọntus Paịlet. Ana m enye gị iwu ka I dobe ihe ahụ e nyere n’iwu. Ekwela ka ọ gbaa mpe. Enwekwala ntụpọ ọbụla, ruo ụbọchị Onyenweanyị Jesu Kristi ga-apụta ihe. Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site n’ike Chineke, onye naanị ya dị ngọzi, onye naanị ya na-achị ụwa niile, Eze nke ndịeze, Dinwenụ nke ndị nwe mmadụ, onye naanị ya bụ anwụanwụ onye bi n’ime ihe nke mmadụ na-apụụghị ịbịaru nso, onye anya mmadụ ahụbeghị, mọbụ nwee ike ịhụ. Ka nsọpụrụ na ọchịchi ebighịebi dịrị ya, Amen.
Okwu Nke Osebụrụwa
Ekele dịrị Chukwu.
MBEKU
Alleluia, Alleluia
Ngọzi dịrị eze ahụ bịara n’aha Onyenweanyị, udo dịrị ụwa! Ebube dịrị! Alleluia
OZIỌMA
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma di nsọ nke Luk dere: 16:19-31
Cheta na mgbe ị nọ n’ụwa, i nwetara ezi ihe nke gị, n’otu aka ahụ, Lazarọs nwetara sọsọ ahụhụ
Jesu gwara ndị Farisii sị, “Ọ dị otu onye ọgaranya nke na-eyi akwa uhieuhie na ezi akwa ọcha, onye na-anọ n’oriri na ọňụňụ ụbọchị niile. O nwere otu ogbenye ọnya jụrụ n’ahụ, a na-akpọ Lazarọs nke na atọgbọ n’ọnụụzọ ama ya. Ihe dị ya mkpa bụ iri iperipe nri si n’oche nri eze dapụ. Ọ bụladị ụmụnkịta na-abịa aracha onya ya. Mgbe ogbenye a nwụrụ, ndị mmụọọma buuru ya buga n’akụkụ Abraham n’ala mmụọ; ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya. Mgbe ọ nọ n’ọkụmmụọ na-ahụju anya, o letịrị anya hụ Abraham n’ebe dị anya ka Lazarọs nọ n’akụkụ ya. O tiri mkpu sị: “Nna anyị Abraham, biko, mere m ebere. Zitenụ Lazarọs ka o detụ ọnụ mkpịsịaka ya na mmiri mejụọ ire m, n’ihina anọ m ahụụfụ n’etiti ire ọkụ nke a.” Abraham zara ya sị, “Nwa m, cheta na mgbe ị nọ n’ụwa, i nwetara ezi ihe nke gị, n’otu aka ahụ, Lazarọs nwetara sọsọ ahụhụ.
Ma ugbu a, a na-akasị ya obi n’ebe a, ma gị onwe gị nọ n’ahụụfụ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, e mere ka oke olulu dị n’etiti anyị na ụnụ, ka ndị chọrọ isi ebe a bịakwute ụnụ ghara inwe ike, ka onye ọbụla gharakwa isi ebe ahụ bịakwute anyị.” Ọ rịọkwara sị, “Ebe ọ dị otu a, biko, arịọ m gị ka i ziga ya n’ụlọ nna m, n’ihina enwere m ụmụnne ise, ka ọ dọo ha aka na ntị ka ha onwe ha ghara ịbata n’ebe mmekpaahụ a.” Abraham zakwara ya sị, “Ha nwere iwu Mosis na ndịamụma, ha gee ha ntị.” Ma ọgaranya ahụ zara ya sị, “Ee, nna anyị Abraham, a sị na otu onye ga-esi n’ala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.” Abraham gwakwara ya sị, “Ọ bụrụ na ha anụghị olu Mosis na nke ndịamụma, ha agaghị echegharị, ọ bụladị na otu onye si n’ala ndị nwụrụ anwụ bịa gwa ha.”
Oziọma nke Osebụrụwa
Otito dịrị Gị, Kristi.