Sunday Reading
October 19, 2025Events
Twenty-ninth Sunday in Ordinary Time. October 19th, 2025. 1st Reading Exodus 17:8-13 2nd Reading 2 Timothy 3:14-4:2. Gospel Luke 18:1-8
IZU NKE IRI ABỤỌ NA ITOLU N’OGE NA-ADANYEGHỊ N’EMUME – AFỌ NKE ATỌ
UKWE MBATA: Abụọma 129:3-4
Ọbụrụ na gị, O Onyenweanyị na-agụ ajọomume anyị ọnụ, Onyenweanyị, onye ga-aguzọ. Mana I na-agbaghara anyị, Chineke nke Izreel.
EKPERE MMEGHE.:
Ka anyị riọ aririọ
(Maka amara Chineke)
Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi
Dinwenụ, biko mee ka amara Gị butere anyị uzo, kpetara anyị azụ oge niile. Nyere anyị aka ka anyị were ezigbo obi na-arụpụta ezigbo ọrụ. Site na Dinwenụ anyị ….
Ma ọ bu
Ka anyị rịọ arịriọ
Nna nke eluigwe, Onye ji ike niile, I ji aka ịhụnanya nke obiọma Gị, jirikwa nwayọọ, na-achịkwa oge niile nke ụbọchị anyị. Biko butere anyị uzo n’ije anyị na ndụ a. Gbooro anyị mkpa anyị tupu anyị kpọkuo Gị. Ekwela ka anyị dafuo. Zidata Mmụọ Gị ka O jikọọ anyị n’okwukwe, ka anyị soro n’ọrụ Gị, were soro ñụrịa ọñụ n’ihu Gị. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa Gị..
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ
Ihe ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ 17:8-13
Oge ọbụla Mosis weliri aka ya elu ụmụ Izrel
Ndị Amalek busoro ụmụ Izrel agha na Refidim. Mosis nyere Jọshụa ike sị, Họpụtara anyị ndị mmadụ, ma jee buso ndị Amalek agha; echi, aga m eji mkpara nke Chineke n’aka gaa kwụrụ n’elu ugwu. Jọshụa wee bụso ndị Amalek agha dịka Mosis siri gwa ya, ma Mosis, Erọn na Họọ rigooro n’elu ugwu. Oge ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ụmụ Izrel na-enwe mmeri ma oge ọbụla o wedara aka ya, ndị Amalek emeriwe ha. Ya mere, mgbe ike gwụrụ Mosis, ha ewere okwute dowara ya, ọ nọdụ ala n’elu ya, ebe Erọn na Họọ jigidere aka ya n’elu, otu n’aka ekpe, nke ọzọ n’aka nri, otu a ka aka ya siri kwụrụ n’elu ruo mgbede. N’ihi nke a, Jọshụa na ndịagha ya ji mmaagha gbupịa ndịagha Amalek.
Okwu Nke Osebụrụwa
Ekele dịrị Chukwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 121: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8
Azịza (V. 2): Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị, onye mere eluigwe na ala.
- Ewelitere m anya m n’eluugwu
Kedu ebe enyemaka m ga-esi abịa?
Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị,
onye mere eluigwe na ala. Az./
- Ọ gaghị ekwe ka ihe ọbụla mee gị
N’ihina onye nche gị anaghị arahụ ụra
Lee, onye nche nke Izrel
anaghị ehi ụra, nke ọ na-ekwo ụra. Az./
- Osebụrụwa bụ onye na-eche gị
Ọ nọ n’akụkụ gị na-echekwaba gị
Anyanwụ agaghị achagbu gị n’ehihie
Nke ọnwa na-etigbu gị n’abalị. Az./
- Osebụrụwa ga-echedo gị n’ihe ọjoo niile
Ọ ga echekwa ndụ gị
Osebụrụwa ga-echedo ọpụpụ gị na mbata gị
Bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi. Az./
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ
Ihe ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Nke Abụọ degaara Timoti 3:14 – 4:2
Onye were onwe ya nye Chineke na-akwụsi ike, bịakwa jikere nke ọma maka ịrụ ọrụ ọma ọ bụla
Ma gị onwe gị, nọgidesieike n’ihe ị mụtara na ihe I kwenyesiri ike na ya, ebe ị maara onye I si n’aka ya mụta ha. I maara na ọ bụ site n’oge ị bụ nwata ka ihe e dere n’akwụkwọ nsọ doro gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site n’okwukwe I nwere na Jesu Kristi. Ihe niile e dere n’Akwụkwọ nsọ si na mkpalite nke Chukwu. Ha bakwara uru iji na-akuzi ihe, ịgwa mmadụ mmeghe ya, ịgbaziri na inye ọzụzụ na ndụ eziomume. N’ụzọ dị otu a, onye nke Chukwu ga-ezuoke, dị nkwadebe maka ezi ọrụ ọbụla. Ana m adọ gị aka na ntị n’ihu nke Chineke na Jesu Kristi, Onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ma site n’ọbịbịa ya n’alaeze ya, kwusaa oziọma. Dị uchu n’ọrụ a, ma ọ dị mma ma ọ dị njọ, ma mmiri ọ na-ezo ma anwụ ọ na-acha. Mee ka ha kwenye, baara ha mba ma gbakwaa ha ume. Adala mba n’inwe ndidi na nkuzi.
Okwu Nke Osebụrụwa
Ekele dịrị Chukwu.
MBEKU
Alleluia, Alleluia
Okwu Chineke bụ okwu dị ndụ, na-adikwa ire. Ọ na-enyocha echiche na izu niile nke obi. Alleluia
OZIỌMA 18:1-8
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma di nsọ nke Luk dere:
Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọkụ ya
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya ụkabụilu iji kuziere ha na ọ dị mkpa ka ha nọgide n’ekpere mgbe niile, ghara ịda mba. Ọ gwara ha sị: “N’otu obodo, e nwere otu onye ọkaikpe nke na-anaghị atụrụ Chineke egwu, nke ọ na-asọpụrụ mmadụ ibe ya. E nwekwara otu nwaanyị isimkpe bikwa n’obodo ahụ, onye na-abịakwute ọkaikpe a kwa mgbe kwa mgbe na-arịọ ya sị, ‘Kpepụta m n’aka onye iro m.’ Na mbụ onye ọkaikpe a achọghị ịnụ arịrịọ nwaanyị a. Ma o mesịrị tụgharịa obi sị, “Ọ bụ eziokwu na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụkwara mmadụ, ma n’ihi nsogbu nwaanyị isimkpe a na-enye m, aga m ekpepụta ya. Ọ bụrụ na m emeghị otu a, ọ ga-abịagide na-esogbu m, agaghị m ezuru ya ike.” Onyenweanyị kwukwara sị, “Nụrụnụ ihe onye ọkaikpe a, nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi kwuru. Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọkụ ya ehihie na abalị? Ọ ga-egbu oge tupu ọ zọpụta ha? Agwa m ụnụ, Ọ ga-ekpepụta ha ọsọọsọ. Ka o sila dị, mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ ga-enwetekwa ndị nwere okwukwe n’elu ụwa?”
Oziọma nke Osebụrụwa
Otito dịrị Gị, Kristi.
EKPERE NHUNYE
Onyenweanyị, biko nara onyinye na arirịọ nke anyị bụ ndị kwerenụ. Site n’aja nke a dị nsọ na ofufe nsọ anyị na-efe Gị, mee ka anyị bata n’otito nke eluigwe. Site na Kristi Dinwenụ anyị
UKWE ORIRI NSỌ: Abụọma 34:11
Agụụ nwere ike gụọ ụmụ ọdụm mana iheọma anaghị akọ n’ebe ndị na-achọ Onyenweanyị nọ
Ma ọ Bụ
Anyị maara na mgbe Dinwenụ ga-apụta ìhè, anyị ga-adịka ya, n’ihina anyị ga-ahụ ya otu O dị. (1Jọn 3:2)
EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ
Ka anyị rịọ arịrịọ
Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi
Dinwenụ, anyị ji umeala arịọ ebube eze Gị, otu I si were Ahụ na Ọbara nke a kacha nsọ zụọ anyị, biko si otu ahụ mee ka anyị soro rite oke n’ịbụ Chukwu nke Gị. Site na Kristi Onyenweanyị.